BEKEE N'asụsụ Nke Gị

BEKEE N'asụsụ Nke Gị Maka ezi ntụziaka nkuzi nkọwa nkwuputa ndepụta ịma ọkwa ọdị na mma ịdị n'otu ịh?

Ebum n'uche m n'ile bu na ọ ga-adiri gi na mma mgbe n'ile.Ana m asi ka Chineke gozie gi, chekwa gị, kwado gi na-igba mbọ...
01/12/2025

Ebum n'uche m n'ile bu na ọ ga-adiri gi na mma mgbe n'ile.
Ana m asi ka Chineke gozie gi, chekwa gị, kwado gi na-igba mbọ n'ile nke ndụ gi, ọga n'ihu na obi ụtọ.
Ọ dịgooro anyị na mma.
Chukwu Okike a gọzie n'uzo pụrụ iche na-afo a nakwa na-afo ndị dị ọzọ dị na-ihu.
Ụnu atụkwana-egwu ọzo maka Chineke nọnyere ụnụ n'ile Mgbe n'ile.

01/12/2025

Mmadụ
............

Mmadụ
Mma ndụ

Mmadụ bu mma ndụ
Mma ndụ bu mmadụ

Okike kere ụwa kere mmadụ
Kee ya nye ya echiche

Mmadụ mara mma
Mma nke dị ndụ

Mmadụ maara ihe
Mmanụ ndụ pụrụ iche

Mmadụ bú mma ndụ
N'ihi odi íchè dị mma

Mma ndụ bú mmadụ
Nwere ike mebie m'ọbu mezie

Mmanụ ndụ bu mmadụ
Onweghi oyiri

N'agbanyeghi n'obu
Chineke kere uwa.

© Maduabuchi Ezeugo

18/04/2025

Remembering the fathers for what they really are - cross bearers of the family without exaggerations.

18/04/2025

Lifting up an old structure to add more apartments under!
Standing in edge to accomplish a thing assumedly impossible.

17/04/2025

Nwanyị bu agwọ ndụ na ekete
N'aha n'etiti ụzọ
Ọ maghị na agwọ nọ n'ime ekete ya
Ka ọ pụtara n'etiti ụzọ
Ọ chuputara na agwọ nọ n'ime ekete ya
Ọ were ụjọ tụpụ ekete ya n'ala
Agwọ ahụ siri n'ime ekete ahụ riputa were nwa-yoo n'acho iriba n'ime ọhịa...

17/04/2025

Don'ty Try This At Home.

17/04/2025

Nke abuọ:

Ọbụ site n'aka gi kam siri nye ihe n'ile ekere eke ezi ọnọdụ maka udo na mbawanye nke okike
Amaaram gị karịa k'imaara onwe gị
Ọ bidoro site na mgbe anya ọbụna n'ahụbeghi gi
M'obu echiche ọbụna chee uche rute ebe inọ
Rute oge ahụrụ gị anya dika apịtị nọ n'elu ala
Amaara m onye ịbụ marakwa ihe ịga-abu na ndụ
Amam ụbọchị n'ile nke ndụ gị dịka M siri mara ọnụ-ogu nke kpakpando ole nọ n'elu igwe marakwa ọnụ ọgụ mkpụrụ aja n'ile nọ n'elu ala n'otu-n'otu
Site na mbido ruo na njedebe nke ndudugandu n'ile
Dịka M siri mara ndụ n'elu ụwa n'ile gbaa gburugburu
Site na mgbe echiche mmadụ n'apughi ọpụ igaru-agaru
Dịka M siri mara na mbido ka M siri marakwa na nkwusi

"Ụjọ atụna gị
Egwu atụna gị m'oli
Ekwekwena ka ịtụ egwu mee ka idaa mbah ịgba mbọ maka ezi ọganihu nke ndụ ụnụ

Gbasara ụwa mmebi okwukwara si:

"Agaghịkwam emebi ụwa ọzọ
Atuzina egwu maka ụwa mmebi
Maka agaghikwam emebi ụwa ọzọ
Dịka ụnụ si n'atu anya
Ndị g'emebi ụwa bụ ụnụ ndi mmadụ
Site n'ajo olile anya nke ụnụ
Site n'akparamagwa nke ụnụ
Site n'ikpo asi nke ụnụ kpọrọ onwe ụnụ
Site n'inwe anya-ukwu dika ụnụ nwere n'etiti onwe ụnụ
Site n'igba ekworo
Site n'ibu omegbu n'obi oge n'ile dika ụnụ si eme
Site n'adighi n'otu nke ụnụ
Site n'inwe mmasị ịbụ sọọsọ onye-ana-ekwu maka ya n'ime obodo
Site n'aghotaghi nke ụnụ maka ịghọta ihe inwe ezi agbata obi pụtara
Ụnụ n'ewere ọnọdụ n'ogbako ụmụ nne dịka agadagbachiriuzo!
Ọtụtụ n'egosi oge n'ile n'obu sọọsọ ha kwesiri inwe ọganihu ma ka ibe ha ndị ọzọ buru ndi ọganihu n'ekwesighiekwesi chaa-chaa iwere ọnọdụ na ndụ ha

Ewepugom aka banyere etu ụnụ chọrọ k'uwa dịrị
Ọ bụrụ na mba ndị ụwa chọrọ ka ụwa digide ụwa g'adigide
Ọ bụrụ na ụnụ chọrọ k'ụwa mebie ụwa g'emebi
Onweghi ihe ọzọ Mụ bụ Chineke kere eke ike ya karịrị Ike nke mmadụ
Ụjo ọbụna atuzina ụnụ
Mgbe oge zuoro
Ụnụ g'aghọta ihe mere ụnụ jiri bụrụ mmadụ
Ugbua ụnụ n'agba (ụrọ) ụrụ
Asi M
N'oge dị ugbua
Ụnụ n'agba egwu ọnwa!"

Ezeugomn

14/04/2025

Chukwu sim gwa gi

Nke mbụ:

"Chee ezi echiche mee ezi omume mee ezi ihe ọ gadiri gị mma"

Ọsi gị: Chee ezi echiche mee ezi omume mee ezi ihe
Oga adịrị gị mma

Chukwu hụrụ ụwa n'anya nke ukwuu
Onwere nnukwute ebum n'obi mara mma gbasara ihe n'ile dị n'ụwa dika eluigwe elu-ala oshimiri
(Orimiri) anyanwu ọnwa kpakpando anumanu mmadụ oshíshí nnụnụ ụkpala ahụhụ na ngwere

Nke a mere olile anya ya banyere ndụ gị enweghị atụ m'oli
Maka ọbu gị bụ isi ahụrụ kwaa okpu
Nkea putakwara na onwekwara nnukwu ntukwasi obi ebe inọ

Chukwu sim gwa gi
Chukwu sim kaara gị
Chukwu sim kowaara gi nke ọma na ya enweghị ike ilefu gị anya m'oli
M'obu kpoputa gị n'etiti ụzọ menyuo ọkụ maka ya onwe ya abụghị mmadụ
Ọsi na oge n'ile nke ndụ gị
Ọbụ sọọsọ ya bu Chukwu bụ olile anya inwere n'elu ụwa
N'gbanyeghi ihe ụnụ bu ndị mmadụ kpọrọ Chineke ụnụ
N'ime mgbagoju anya gị n'ile na ndụ ọbu ya bu Chukwu bu sọọsọ ebe ezi olile anya na nkowa maka ezi nghota nke gị

Ọsi, "Enweghị m mmasị igharipu gi m'oli n'uzo ọ bụna n'ime okike nke ndụ mmadụ"

Osikwam gwakwa gị na ya bu Chineke gị
Ọ bu ya nyere gị ndụ nyekwa ọtụtụ ihe n'ile ọzọ ahụ ekere eke no n'elu ụwa
Ọsi:
"Mana ịhụ-na-anya nke M hụrụ gị pụrụ iche n'ụdị nke ya"

N'ihi nke a
Enyere M gi ndụ
Nye kwa gị amamihe zuru oke banyere ndụ gi na ndụ ihe n'ile ekere eke na n'ime eluigwe na n'elu ụwa..."

Chukwu sim gwa gi Nke mbụ:"Chee ezi echiche mee ezi omume mee ezi ihe ọ gadiri gị mma"Ọsi gị: Chee ezi echiche mee ezi o...
25/03/2025

Chukwu sim gwa gi

Nke mbụ:

"Chee ezi echiche mee ezi omume mee ezi ihe ọ gadiri gị mma"

Ọsi gị: Chee ezi echiche mee ezi omume mee ezi ihe
Oga adịrị gị mma

Chukwu hụrụ ụwa n'anya nke ukwuu
Onwere nnukwute ebum n'obi mara mma gbasara ihe n'ile dị n'ụwa dika eluigwe elu-ala oshimiri (Orimiri) anyanwu ọnwa kpakpando anumanu mmadụ oshíshí nnụnụ ụkpala ahụhụ na ngwere

Nke a mere olile anya ya banyere ndụ gị enweghị atụ m'oli
Maka ọbu gị bụ isi ahụrụ kwaa okpu
Nkea putakwara na onwekwara nnukwu ntukwasi obi ebe inọ

Chukwu sim gwa gi
Chukwu sim kaara gị
Chukwu sim kowaara gi nke ọma na ya enweghị ike ilefu gị anya m'oli
M'obu kpoputa gị n'etiti ụzọ menyuo ọkụ maka ya onwe ya abụghị mmadụ
Ọsi na oge n'ile nke ndụ gị
Ọbụ sọọsọ ya bu Chukwu bụ olile anya inwere n'elu ụwa
N'gbanyeghi ihe ụnụ bu ndị mmadụ kpọrọ Chineke ụnụ
N'ime mgbagoju anya gị n'ile na ndụ ọbu ya bu Chukwu bu sọọsọ ebe ezi olile anya na nkowa maka ezi nghota nke gị

Ọsi, "Enweghị m mmasị igharipu gi m'oli n'uzo ọ bụna n'ime okike nke ndụ mmadụ"

Osikwam gwakwa gị na ya bu Chineke gị
Ọ bu ya nyere gị ndụ nyekwa ọtụtụ ihe n'ile ọzọ ahụ ekere eke no n'elu ụwa
Ọsi:
"Mana ịhụ-na-anya nke M hụrụ gị pụrụ iche n'ụdị nke ya"

N'ihi nke a
Enyere M gi ndụ
Nye kwa gị amamihe zuru oke banyere ndụ gi na ndụ ihe n'ile ekere eke na n'ime eluigwe na n'elu ụwa..."

10/09/2023

Biko nwanne m ebezina
Uwa ebighi na akwa!

Na agbabyeghi ihe mere eme
Obu uche Chineke na ndi nke ya g'enwe ezr olile anya mgbe n'ile.
Emesia obu sooso ya bu Chukwu g'emere onye dika uche ya siri Cho.

Untie Him And Let Him Go!
04/03/2023

Untie Him And Let Him Go!

Great Ingenious People Of Biafra

Ipob Media Campaign to Release Onyendu Mazi Nnamdi Kanu
Join us tomorrow been 5th Mar 2023
All must hail Biafra
1pm Biafra Time
You don't want to miss this one tomorrow 👀

Address

Akwuakuma
Owerri

Telephone

+2349130075464

Website

Alerts

Be the first to know and let us send you an email when BEKEE N'asụsụ Nke Gị posts news and promotions. Your email address will not be used for any other purpose, and you can unsubscribe at any time.

Contact The University

Send a message to BEKEE N'asụsụ Nke Gị:

Share