05/07/2025
MMEMME NNABATA NDỊ AFỌ NKE MBỤ NA NZIPU NDỊ AFỌ NKE ANỌ NKE NGALABA AMỤMAMỤ IGBO, AFRỊKA NA NZIKOỌRỊTAOZI.
Ụmụ akwụkwọ ngalaba amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi, fakọọltị ke Aatị, mahadum Nnamdi Azikiwe na-enwe obi aṅụrị n'ihi mmemme ndị isi ngalaba ahụ chịkọbara iji nabata ndị afọ nke mbụ na ngalaba ahụ ma sị ndị afọ nke anọ jee nke ọma, n'abalị iri abụọ nke ọnwa June, afọ 2025.
Mmemme a nke biri ọkụ n'ụlọ ezumezu fakọọltị ke Aatị, mahadum Nnamdi Azikiwe bụ nke e mere n'ụzọ dere ude, dịka Asso. Professor Ikechukwu Umeh, Unizik Alumni Global President na Maazị Christopher Molokwu, CEO/MD Anambra Broadcasting Service (ABS) nọnyere ha n'oge mmemme ahụ.
N'okwu ya, Dọkịta Chioma Anagor dịka ọ na-enye nkuzi n'isiokwu mmemme ahụ nke bụ "Beyond Academics, Founding Potentials", dụrụ ụmụ akwụkwọ ngalaba ahụ ọdụ ịgba mbọ hụ na ha tinyere onyinye Chukwu Okike nyere ha n'ọrụ ma ọ bụ mụọ akaọrụ, na-ekwu na ọ bụ eziokwu na ịgụ akwụkwọ bara oke uru mana ọ dị oke mkpa na onye ọbụla nwere ihe ndị ọ maara eme ma e wepu agụmakwụkwọ.
Asso. Professor Umeh, kwuru na ọ bụghị ihe onye gụrụ na mahadum ka a na-ajụzi ase ya k**a ihe onye ga-emenwu. Nke a ka o jiri maka ya dụọ ụmụ akwụkwọ ahụ ọdụ ka onye ọbụla tinye uchu n'ịmụ akaọrụ ma ọ bụ tinye onyinye Chukwu nyere ya n'ọrụ, ma hụ na ha alaghachịghị azụ n'agụmakwụkwọ ha maka na ọ bụ aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ.
Maazị Molokwu, CEO/MD ABS echefughi ịgwa ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha gba mbọ hụ na e tinyere asụsụ Igbo n'igwe AI maka odide, nkuzi, ọmụmụ na nchekwaba ya bụ asụsụ maka ọgbọ ndị ka na-abịa abịa.
Ọkammụta Nkọlị Nnyigide, onyeisi ngalaba amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi n'okwu nke ya, kelere ndị nduzi ụmụ akwụkwọ ha, Dọkịta Uju Ibe na dọkịta Charles Nneke, ndị nkuzi niile nke ngalaba ahụ, onyeisi ụmụ akwụkwọ ngalaba ahụ, Comrade Nwokoma Eric nakwa ndị otu ya niile maka ezi mbọ ha ịhụ na mmemme ahụ bụ nke e mere nke ọma, dịka ọ na-ekwu na mmemme ahụ bụ ọkaibe ya kamgbe ngalaba ahụ malitere.
Ụmụ akwụkwọ ahụ gosipụtara ihe ngosi dị iche iche dịka ịgba egwu, ịgụ egwu, ịkọ akụkọ ụwa, ime ihe ngosi na ihe ndị ọzọ.
Na ngwụcha mmemme ahụ, Comrade Nwokoma Eric, onyeisi ụmụ akwụkwọ ngalaba a kelere mmadụ niile maka ịtụnye oke ha n'ịhụ na mmemme a bụ ọka ibe ya.