National Association of Igbo African and communication studies student

National Association of Igbo African and communication studies student This page is dedicated to promoting the Ìgbo language and other African languages

Walk for life in collaboration with the staffs and student of Igbo African and communication studies department Ngaghari...
01/08/2025

Walk for life in collaboration with the staffs and student of Igbo African and communication studies department

Ngaghari ahuike na ndú di n'etiti ndi nkuzi na umuakwụkwo ngalaba Igbo African and communication studies ✌️✅

15/07/2025

Ụmụakwụkwọ Igbo Unizik

14/07/2025

Anyị gụọ anyị echekwa ndu # igboamaka

10/07/2025

Ụmụakwụkwọ Igbo
Ịgba na-aza oku

MMEPE NGWA OMENKAOtu Indigenous Hands and Voices (IHAV) etikọọla isi ọnụ ha na ngalaba Lingwistiks, ngalaba amụmamụ Igbo...
06/07/2025

MMEPE NGWA OMENKA

Otu Indigenous Hands and Voices (IHAV) etikọọla isi ọnụ ha na ngalaba Lingwistiks, ngalaba amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi na Igbo Village and Institute of African Heritage Studies nke mahadum Nnamdi Azikiwe, Awka wee mepee ngwa Omenka, n'ọgbakọ ha chịkọbara n'abalị iri nke ọnwa June, afọ 2025, nke biri ọkụ n'ụlọ ezumezu fakọọltị ke Aatị, mahadum Nnamdi Azikiwe, Awka.

Ọgbakọ a nke ụfọdụ ndị gụrụ akwụkwọ gara, dịka ọkammụta Carol Arinze-Umobi, onye na-arụ ọrụ onyeisi mahadum Nnamdi Azikiwe, ọkammụta George Onwudiwe, Diin fakọọltị ke Aatị, ọkammụta Dereck-Martins Orji, onyeisi ngalaba Lingwistiks, ọkammụta Nkọlị Nnyigide, onyeisi ngalaba amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi, nakwa ndị ọzọ a ma ama na mahadum ahụ gara, ka e kwuru na ọ bụ nke kpụ ọkụ n'ọnụ ma bụrụ nke ụmụ akwụkwọ ndị gara hụtara dịka nke dị oké mkpa maka nkwalite na nchekwa asụsụ Igbo, dịka isiokwu ọgbakọ ahụ bụ "Omenka App as a Modern Tool for Igbo studies".

MMEMME NNABATA NDỊ AFỌ NKE MBỤ NA NZIPU NDỊ AFỌ NKE ANỌ NKE NGALABA AMỤMAMỤ IGBO, AFRỊKA NA NZIKOỌRỊTAOZI.Ụmụ akwụkwọ ng...
05/07/2025

MMEMME NNABATA NDỊ AFỌ NKE MBỤ NA NZIPU NDỊ AFỌ NKE ANỌ NKE NGALABA AMỤMAMỤ IGBO, AFRỊKA NA NZIKOỌRỊTAOZI.

Ụmụ akwụkwọ ngalaba amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi, fakọọltị ke Aatị, mahadum Nnamdi Azikiwe na-enwe obi aṅụrị n'ihi mmemme ndị isi ngalaba ahụ chịkọbara iji nabata ndị afọ nke mbụ na ngalaba ahụ ma sị ndị afọ nke anọ jee nke ọma, n'abalị iri abụọ nke ọnwa June, afọ 2025.

Mmemme a nke biri ọkụ n'ụlọ ezumezu fakọọltị ke Aatị, mahadum Nnamdi Azikiwe bụ nke e mere n'ụzọ dere ude, dịka Asso. Professor Ikechukwu Umeh, Unizik Alumni Global President na Maazị Christopher Molokwu, CEO/MD Anambra Broadcasting Service (ABS) nọnyere ha n'oge mmemme ahụ.

N'okwu ya, Dọkịta Chioma Anagor dịka ọ na-enye nkuzi n'isiokwu mmemme ahụ nke bụ "Beyond Academics, Founding Potentials", dụrụ ụmụ akwụkwọ ngalaba ahụ ọdụ ịgba mbọ hụ na ha tinyere onyinye Chukwu Okike nyere ha n'ọrụ ma ọ bụ mụọ akaọrụ, na-ekwu na ọ bụ eziokwu na ịgụ akwụkwọ bara oke uru mana ọ dị oke mkpa na onye ọbụla nwere ihe ndị ọ maara eme ma e wepu agụmakwụkwọ.

Asso. Professor Umeh, kwuru na ọ bụghị ihe onye gụrụ na mahadum ka a na-ajụzi ase ya k**a ihe onye ga-emenwu. Nke a ka o jiri maka ya dụọ ụmụ akwụkwọ ahụ ọdụ ka onye ọbụla tinye uchu n'ịmụ akaọrụ ma ọ bụ tinye onyinye Chukwu nyere ya n'ọrụ, ma hụ na ha alaghachịghị azụ n'agụmakwụkwọ ha maka na ọ bụ aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ.

Maazị Molokwu, CEO/MD ABS echefughi ịgwa ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha gba mbọ hụ na e tinyere asụsụ Igbo n'igwe AI maka odide, nkuzi, ọmụmụ na nchekwaba ya bụ asụsụ maka ọgbọ ndị ka na-abịa abịa.

Ọkammụta Nkọlị Nnyigide, onyeisi ngalaba amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi n'okwu nke ya, kelere ndị nduzi ụmụ akwụkwọ ha, Dọkịta Uju Ibe na dọkịta Charles Nneke, ndị nkuzi niile nke ngalaba ahụ, onyeisi ụmụ akwụkwọ ngalaba ahụ, Comrade Nwokoma Eric nakwa ndị otu ya niile maka ezi mbọ ha ịhụ na mmemme ahụ bụ nke e mere nke ọma, dịka ọ na-ekwu na mmemme ahụ bụ ọkaibe ya kamgbe ngalaba ahụ malitere.

Ụmụ akwụkwọ ahụ gosipụtara ihe ngosi dị iche iche dịka ịgba egwu, ịgụ egwu, ịkọ akụkọ ụwa, ime ihe ngosi na ihe ndị ọzọ.

Na ngwụcha mmemme ahụ, Comrade Nwokoma Eric, onyeisi ụmụ akwụkwọ ngalaba a kelere mmadụ niile maka ịtụnye oke ha n'ịhụ na mmemme a bụ ọka ibe ya.

05/07/2025

Daalụnụ rinne Ndị ụlọ ọrụ ASB.

Ụnụ emeka!

Ụmụ akwụkwọ afọ nke anọ nke ngalaba amụmamụ Igbo, Afrịka na nzikọrịtaozi, mahadum Nnamdi Azikiwe gara njem nleta Maazị C...
05/07/2025

Ụmụ akwụkwọ afọ nke anọ nke ngalaba amụmamụ Igbo, Afrịka na nzikọrịtaozi, mahadum Nnamdi Azikiwe gara njem nleta Maazị Chinedum Ofomata ụnyahụ, abalị atọ nke ọnwa Julaị, afọ 2025 na ngalaba ụlọọrụ ya dị n'Igwebuike junction dị n'Awka ịka a.

Maazị Ofomata nabatara ụmụ akwụkwọ ahụ nke ọma ma nyekwa ha ụsa n'ajụjụ ọnụ niile ha gbara ya banyere akwụkwọ agụmagụ ndị o depụtarala, dụọ ha ọdụ ka onye ọbụla gba mbọ na-eme ihe ọbụla ọ mara eme nakwa ọnatarachi ya nke ọma maka na ọ bụ nkụ onye kpara n'ọkọchị ka ọ na-anya n'udu mmiri, ma nyekwazie onye ọbụla n'ime ha akwụkwọ agụmagụ ya dịka ihe onyinye. Ọ chefughi inye onyeisi ngalaba Igbo, Ọkà mmụta Nkọlị Nnyigide akwụkwọ ọgụgụ ya atọ ndị o bipụtara n'afọ a anyị nọ n'ime ya.

N'ikpeazụ, ụmụ akwụkwọ ahụ kelere ya maka ezi nnabata ya nakwa onyinye akwụkwọ o nyere ha dịka ha kpeere ya ekpere ezi ahụike na ndụ ogologo. Ha sere foto dị iche iche na ngwụcha ọnụnọ ha n'ụlọọrụ ya iji na-echeta njem nleta a pụrụ iche n'ọdịnihu.

04/07/2025

Ụmụ akwụkwọ afọ nke anọ nke ngalaba amụmamụ Igbo, Afrịka na nzikọrịtaozi, mahadum Nnamdi Azikiwe gara njem nleta Maazị Chinedum Ofomata ụnyahụ, abalị atọ nke ọnwa Julaị, afọ 2025 na ngalaba ụlọọrụ ya dị n'Igwebuike junction dị n'Awka ịka a.

21/06/2025

Na mahadum Nnamdi Azikiwe ka ọ kpọtụrụ ụnyaa.

Lee ndị afọ nke mbụ, ụmụakwụkwọ igbo Unizik ka ha si na-ayọrị egwu n'emume nnabata ha.

Taa ka mmiri ozuzo a mara ọkwa ya ga-eru ala.Bịa nọnyere ụmụakwụkwọ igbo taa ka ha na-anabata ụmụakwụkwọ nọ n'ogo nke mb...
20/06/2025

Taa ka mmiri ozuzo a mara ọkwa ya ga-eru ala.

Bịa nọnyere ụmụakwụkwọ igbo taa ka ha na-anabata ụmụakwụkwọ nọ n'ogo nke mbụ ha ma na-ezipụkwa ndị nke nọ egwu ụna.

Address

Along Enugu-Onitsha Expressway, 420110, Ifite Awka, Nigéria
Ifite Awka

Website

Alerts

Be the first to know and let us send you an email when National Association of Igbo African and communication studies student posts news and promotions. Your email address will not be used for any other purpose, and you can unsubscribe at any time.

Share